Please note that past questions help you understand how exam questions are set.

GET STUDENTSDASH APP
EBSU Past Questions

GST 105 (Carryover – Old Code) Past Questions and Answers

  1. Ihe na-ebuwe ụzọ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ?
    A. asịrị
    B. esemokwu
    C. ekele
    D. omenaala
    Answer: C
  2. Ndị Igbo sịrị “ekwee ekele”
    A. obi ụtọ adị
    B. udo adị
    C. enwee nghọta
    D. ihu asaa
    Answer: D
  3. Ibọọlachi bụ ekele
    A. ehihe
    B. abalị
    C. ụtụtụ
    D. agbamume
    Answer: C
  4. Naawo bụ ekele
    A. ehihe
    B. abalị
    C. ụtụtụ
    D. agbamume
    Answer: C
  5. Kachifoo bụ ekele
    A. ehihe
    B. abalị
    C. ụtụtụ
    D. agbamume
    Answer: B
  6. Obodo na-ekele jọọkwa n’ala Igbo bụ ndị
    A. Ọhọzara
    B. Nkanụ
    C. Abịrịba
    D. Afikpo
    Answer: D
  7. Ụzọ ọzọ ndị Igbo si ezipụta ekele bụ site na
    A. ịchị ọchị
    B. ibi ọma
    C. ikwe isi
    D. mkparịta ụka
    Answer: B
  8. Kedu nke na-abụghị ụzọ ndị Igbo si ezipụta ekele
    A. nnupu isi
    B. ibi ọma
    C. ikwe n’aka
    D. ekele ọnụ
    Answer: A
  9. N’ala Igbo ikwe n’aka bụ
    A. ekele
    B. ọgụ
    C. mgba
    D. ịkwa emu
    Answer: A
  10. Daalụ bụ ekele
    A. ehihe
    B. abalị
    C. ụtụtụ
    D. agbamume
    Answer: D
  11. Ekele onye rụrụ oru ọma bụ
    A. Imeela
    B. abalị ọma
    C. ụtụtụ ọma
    D. Ndo
    Answer: A
  12. Ekele onye ọrịa bụ
    A. Imeela
    B. abalị ọma
    C. ụtụtụ ọma
    D. Ndo
    Answer: D
  13. Kedu nke na-abụghị ekele onye na-arụ ọrụ
    A. Ị dị ike ọrụ
    B. Jisie ike
    C. Daalụ ọlụ
    D. Ndo
    Answer: D
  14. Mkpụrụ edemede Igbo bụ ……………….. e ji ede asụsụ Igbo.
    A. ụdaolu
    B. ọtọgrafị
    C. vọwelụ
    D. asụsụ
    Answer: B
  15. Mkpụrụ edemede Igbo dị …………………………………………….
    A. 61
    B. 32
    C. 36
    D. 45
    Answer: C
  16. Ụdaume Igbo dị ………………………………………………………………….
    A. 10
    B. 12
    C. 13
    D. 8
    Answer: D
  17. Mgbochiume Igbo dị ……………………………………………………………
    A. 41
    B. 32
    C. 15
    D. 28
    Answer: D
  18. Ndị a bụ ezi ọmụmaatụ mgbochiume – m, k, g, h – …………………………
    A. Eziokwu
    B. Asị
    C. o weghi m anya
    D. o nwere ike
    Answer: A
  19. Ndị a abụghị ezi ọmụmaatụ mgbochiume – o, u, i – …………………………..
    A. Eziokwu
    B. Asị
    C. amaghị m
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: A
  20. Ụda mfe dị …………………………………….
    A. 4
    B. 6
    C. 8
    D. 2
    Answer: A
  21. Ụda arọ dị ……………………………………..
    A. 3
    B. 5
    C. 4
    D. 8
  22. Mkpụrụ edemede Igbo nwere ntụpọ dị …………………………..
    A. 4
    B. 5
    C. 6
    D. 8
    Answer: A
  23. Mkpụrụ edemede gbara mkpị dị …………………… n’Igbo
    A. 7
    B. 9
    C. 5
    D. 3
    Answer: B
  24. Ọ bụ na mkpụrụ ụdaasụsụ ka esi emepụta mkpụrụokwu …………
    A. Eziokwu
    B. Asị
    C. amaghị m
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: A
  25. Ana-esi na mkpụrụ ụdaasụsụ emepụta isingwaa ……………………..
    A. oweghị m anya
    B. onwereike
    C. Eziokwu
    D. amaghị m
    Answer: C
  26. Ndịa abụghị ọmumaatụ isingwaa – fe, gwa, ri – ……………………………
    A. amaghị m
    B. Asị
    C. Eziokwu
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: D
  27. Enweghiike ijikọta mkpụrụ ụdaasụsụ were mebe mkpụrụokwu ………
    A. Eziokwu
    B. Asị
    C. amaghị m
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: B
  28. /ŋ/ bụ akara (symbol) otu mgbochiume nwere ntụpọ ………………………..
    A. Asi
    B. o nwereike
    C. Eziokwu
    D. amaghị m
    Answer: C
  29. /kp/ bụ akara mgbochiume mkpị ………………………………
    A. amaghị m
    B. Asi
    C. Eziokwu
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: C
  30. Nanị otu n’ime mkpụrụ edemede ndị a bụ mgbochiume – m, k, o, p ………………
    A. Eziokwu
    B. Asị
    C. amaghị m
    D. otu bụ asịsa ya
    Answer: B
  31. Mkpụrụ edemede akara ihe n’okpuru ya bụ …………………………..
    A. mgbochiume
    B. ụdaolu
    C. ụdaume
    D. ntụpọ
    Answer: D
  32. “Akwụkwọ” nwere mkpụrụedemede ………………………………………….
    A. 6
    B. 5
    C. 7
    D. 9
    Answer: B
  33. “Mkputamkpu” nwere mkpụrụ edemede …………………………….
    A. 9
    B. 7
    C. 8
    D. 10
    Answer: C
  34. Nkeji asụsụ Igbo dị olee?
    A. Asaa
    B. Ise
    C. Asatọ
    D. Iri
    Answer: D
  35. Kedu ihe na-abụghị Aha n’ebe a?
    A. Aha mmadụ
    B. Aha ihe
    C. Ọtọgrafị
    D. Aha ebe
    Answer: C
  36. ‘Ọnwụ’ bụ otu n’ime aha ndị a.
    A. Ahaaka
    B. Ahaizugbe
    C. Ahauche
    D. Ahaigwe
    Answer: C
  37. E nwere nnọchiaha ………..
    A. Ise
    B. Asaa
    C. Atọ
    D. Iri
    Answer: B
  38. Kedu mkpụrụedemede e ji emebe nnọchiaha?
    A. Mgbochiume
    B. Ụdamkpị
    C. Ụdange
    D. Ụdaume na myiri ụdaume
    Answer: D
  39. Mkpọaha nwere ngalaba
    A. Anọ
    B. Ise
    C. Asatọ
    D. Iri
    Answer: A
  40. Nnọchiaha bụ okwu na-anọchi …..
    A. Oche
    B. Aha mmadụ
    C. Akwụkwọ
    D. Ngwaa
    Answer: B
  41. Otu n’ime ndị a abụghị njụajụjụ
    A. Anaa
    B. Ebee
    C. Ọ dị mma
    D. Onye
    Answer: C
  42. Nkọwaaha bụ okwu na-akọwa maka
    A. Ngwaa
    B. Aha
    C. Nnọchiaha
    D. Nrụaka
    Answer: B
  43. Mkpọolu bụ ……
    A. M
    B. Anyị
    C. Unu
    D. Ha.
    Answer: A
  44. Ụbara onye atọ bụ ………
    A. Anyị
    B. m
    C. Unu
    D. Ha
    Answer: A
  45. Nrụaka bụ okwu na-egosi………
    A. Ihe a na-ekwu maka ya.
    B. ihe mmadụ na-eme.
    C. Ebe mmadụ na-aga.
    D. Ọrụ mmadụ na-arụ.
    Answer: A
  46. Ngwaa na-eme ka ahịrịokwu nwee…….
    A. Nghọta zuru oke.
    B. okwu dị ogologo.
    C. Ahịrịokwu maa mma.
    D. Ahịrịokwu nwee isi.
    Answer: A
  47. Mgbakwunye na-eso……….
    A. Nnọchiaha
    B. Nkọwaaha
    C. Mkpọaha
    D. Ngwaa.
    Answer: D
  48. Isingwaa mfe bụ ndị nwere……
    A. otu nkejiokwu.
    B. nkejiokwu abụọ
    C. Nkejiokwu atọ
    D. Nkejiokwu anọ.
    Answer: A
  49. Nnyemakangwaa na-enyere ………..aka iji kwudosie ike n’ahịrịokwu.
    A. Omekangwaa.
    B. Isingwaa
    C. Isingwaa mfe
    D. Ngwaa.
    Answer: A
  50. Mmejupụta ngwaa bụ mkpụrụokwu na-esota ngwaa n’…….
    A. Azụ
    B. Ihu
    C. Etiti
    D. Ime.
    Answer: A
  51. Otu n’ime ndị a abụghị ụzọ e si amụba mkpụrụokwu
    A. Ngannihu.
    B. Nsonaazụ
    C. Ọnụọgụgụ.
    D. Nnọneetiti.
    Answer: C
  52. Omekangwaa bụ mkpụrụokwu ……
    A. na-akwudosi ike n’ahịrịokwu.
    B. anaghị akwudosi ike n’ahịrịokwu.
    C. Zuru oke
    D. nwere nghọta.
    Answer: A
  53. A na-eji akara ………..egosi nnyemakangwaa.
    A. Akara ọcha
    B. Akara uhie.
    C. Akara oji
    D. Akara ogologo.
    Answer: B
  54. Aha ndị a na- agụta ọnụ gụnyere ma ewepu …..
    A. Ahaaka.
    B. Aha omee.
    C. . Ahaizugbe.
    D. Ahauche.
    Answer: D
  55. Ọyọkọ ube bụ …..
    A. Ahaigwe.
    B. Ahaaka.
    C. Ahauche
    D. Aha izugbe.
    Answer: A
  56. Kedu nnọchiaha ahịrịokwu a na-akọwa ‘E riri nri’.
    A. Nnọchionye.
    B. Nnọchimpesin.
    C. Nnọchionwe.
    D. Nnọchinkọwa.
    Answer: B
  57. Aha ọnwa bụ ……….
    A. Ahaaka.
    B. Ahaizugbe.
    C. Ahaigwe.
    D. Ahaomee
    Answer: A
  58. Okwu ndị a bụ nkọwaaha ma ewepu…….
    A. Nwanyị ọma.
    B. Ewu oji.
    C. Ọjọọ mmadụ.
    D. Nkịta ọcha.
    Answer: A
  59. Otu n’ime ndị a abụghị njirimara nkọwa.
    A. Nkọwa na-eso mkpọaha.
    B. Nkọwa enweghi ike ikwu naanị ya.
    C. Nkọwa anaghị eso mkpụrụokwu ‘dị’.
    D. Nkọwa anaghị akọwa mkpọaha.
    Answer: B
  60. Mkpụrụokwu a bụ otu n’ime nrụaka.
    A. Ga.
    B. Jee.
    C. Ahụ.
    D. Ka.
    Answer: C
  61. Nrụaka bụ otu n’ime ngalaba……
    A. Nnọchiaha.
    B. Aha.
    C. Nkọwaaha.
    D. Ngwaa.
    Answer: C
  62. Ngalaba ngwaa dị……
    A. Asaa.
    B. Ise.
    C. Isii.
    D. Anọ.
    Answer: B
  63. E si na……enweta okwu ọhụrụ.
    A. Aha.
    B. Ngwaa.
    C. Nnọchiaha.
    D. Nkọwaaha.
    Answer: B
  64. Ngwaa ọbụla ga-enweriri ………
    A. Isingwaa.
    B. Akangwaa.
    C. Ụkwụngwaa.
    D. Ahangwaa.
    Answer: A
  65. ‘Na’ na-arụ ọrụ dịka……
    A. Tensi ndịugbu a.
    B. Tensi Ndịniihu.
    C. Ndịnaazụ.
    D. Njụ.
    Answer: D
  66. ‘Ga’ na-arụ ọrụ dịka…….
    A. Tensi Ndịnaazụ.
    B. Ndịugbua.
    C. Njụ.
    D. Ndịniihu.
    Answer: B
  67. Ọtụtụ okwu Igbo na-amụba site na ………
    A. Aha.
    B. Ngwaa.
    C. Nbọchiaha.
    D. Nkọwaaha.
    Answer: B
  68. Omekangwaa bụ mkpụrụokwu na-esote……
    A. Ngwaa.
    B. Aha.
    C. Mkpọaha.
    D. Nnyemakangwaa.
    Answer: D
  69. Njikọ nwere ike ijikọ ma ewepu………..
    A. Mmadụ na mmadụ.
    B. Aha na aha.
    C. Mkpụrụokwu na mkpụruokwu.
    D. Nnọchiaha na nnọchiaha.
    Answer: A
  70. Mkpụrụokwu ndị a bụ njikọ ma ewezuga………..
    A. na.
    B. ma.
    C. maka.
    D. pụọ.
    Answer: D
  71. Mkpụrụokwu e ji mara mbuụzọ bụ ………..
    A. na.
    B. ka,
    C. ga.
    D. le.
    Answer: A
  72. A na-ederu ‘na’ n’isi mgbe ọ na-esote ……….
    A. Aha.
    B. Mgbochiume.
    C. Ụdaume.
    D. Omekangwaa.
    Answer: B
  73. E nwere nnyemakangwaa olee n’asụsụ Igbo?
    A. Atọ.
    B. Abụọ.
    C. Ise.
    D. Anọ
    Answer: B
  74. Isingwaa kewara ụzọ ……….
    A. Atọ.
    B. Abụọ.
    C. Anọ.
    D. Iri.
    Answer: B
  75. Mfinitivu bụ otu n’ime ndị a…….
    A. eri.
    B. ori.
    C. oriri.
    D. iri.
    Answer: C
  76. Mkpụrụokwu olee ka e ji mara nrụaka?
    A. Abụọ.
    B. Atọ.
    C. Anọ.
    D. Ise.
    Answer: A
  77. Mkpụrụokwu ndị a bụ Nnọchiaha ma ewezuga ……….
    A. Ọ.
    B. Anyị.
    C. Unu.
    D. Chaa.
    Answer: D
  78. E kewara Nkọwaaha ụzọ……..
    A. Isii.
    B. Asaa.
    C. Iri.
    D. Anọ.
    Answer: A
  79. Ọcha bụ nkọwaaha nke………
    A. Nkọwa.
    B. Nkeonye.
    C. Nrụaka.
    D. Nọmba
    Answer: A
  80. ‘A’ na njikọ na-arụtụ. ………
    A. Ihe dị nso aka.
    B. Ihe dị tere aka.
    C. Ihe na-adịghị.
    D. Ihe e merela.
    Answer: A
  81. Omekangwaa na nnyemakangwaa na-ejikọ aka arụ ọrụ dịka…….
    A. Aha.
    B. Ngwaa.
    C. Mkpọaha.
    D. Nnọchiaha.
    Answer: A
  82. Otu n’ime ndị a bụ ahauche
    A. Iwe.
    B. Imirikiti.
    C. Ewu.
    D. Aha obodo.
    Answer: A
  83. Etu edemede kwesịrị ịdị ka ọ wee dị mma kaa aka ma dịkwa ụtọ bụ
    A. akara edeme
    B. usoro edemede
    C. mkpụrụ okwu
    D. ụda
    Answer: A
  84. Ihe ọ bụla e dere ede maka ọgụgụ bụ
    A. edemede
    B. ndebe olu
    C. akara ụda olu
    D. Nsupe
    Answer: A

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Chat With Us?
error: Emmy is Sorry Bruh !!